Isaiah 62

Aha ọhụrụ nke Zayọn

1Nʼihi Zayọn agaghị m emechi ọnụ,
nʼihi Jerusalem agaghị m anọ jii,
ruo mgbe ezi omume ya ga-enwuwa dịka ihe ụtụtụ;
mgbe nzọpụta ya kwa ga-enwukwa dịka ọwaọkụ na-enwu enwu.
2Mba niile ga-ahụ ezi omume gị.
Ndị eze niile ga-ahụkwa ebube gị.
A ga-akpọkwa gị aha ọhụrụ ahụ
nke ọnụ Onyenwe anyị ga-agụ gị.
3Ị ga-aghọ okpueze nke ịma mma nʼaka Onyenwe anyị,
ihe iyi nʼisi nke ndị ụlọeze nʼaka Chineke gị.
4A gakwaghị akpọ gị onye ahapụrụ ahapụ,
maọbụ kpọọ ala gị ala tọgbọrọ nʼefu.
Ma a ga-akpọ gị Hefziba,
kpọkwa ala gị Beula,
nʼihi na ihe gị ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ,
a ga-alụkwa ala gị dịka nwunye.
5Dịka nwokorobịa si alụrụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,
otu a ka Onye na-ewu gị
Ụmụ gị ndị ikom
ga-alụ gị,
dịka onye lụrụ nwunye ọhụrụ sị aṅụrị ọṅụ nʼebe nwunye ọhụrụ ya nọ,
otu a ka Chineke gị ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi gị.

6Enyela m ndị nche ọnọdụ ọrụ nʼelu mgbidi gị niile, Jerusalem.
Ha agaghị edebe ọnụ ha duu mgbe ọbụla, ma ehihie ma abalị.
Unu ndị na-akpọku Onyenwe anyị,
unu enyela onwe unu izuike.
7Unu enyekwala ya izuike tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka Jerusalem guzosie ike,
meekwa ya otuto nke ụwa niile.

8 Onyenwe anyị ewerela aka nri ya
werekwa ogwe aka ya ṅụọ iyi sị,
“Ọ dịghịkwa mgbe m ga-enye mkpụrụ ubi gị
ka ọ bụrụ nri nye ndị iro gị ọzọ,
ọ dịghịkwa mgbe ndị ọbịa ga-aṅụkwa mmanya ọhụrụ ahụ
bụ nke ị dọgburu onwe gị nʼọrụ nʼihi ya.
9Ma ndị were ya ka ihe ubi ga-eri ya,
tookwa Onyenwe anyị,
ndị kpokọtara oroma grepu ga-aṅụ ya
nʼime ogige ebe nsọ m.”

10Gabiganụ! Gabiganụ sitenụ nʼọnụ ụzọ ama niile.
Dozienụ ụzọ maka ndị m.
Wuzienụ ụzọ niile, wuzienụ okporoụzọ niile.
Bupụsịanụ nkume niile,
weliekwanụ ọkọlọtọ maka mba niile.

11 Onyenwe anyị ekwusaala okwu
nye nsọtụ niile nke ụwa sị,
“Gwanụ Ada Zayọn,
‘Lee Onye Nzọpụta gị na-abịa!
Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka,
nkwụghachi nke ọ ga-akwụghachi sokwa ya na-abịa.’ ”
12A ga-akpọ ha Ndị Nsọ,
ndị Onyenwe anyị gbapụtara;
a ga-akpọkwa unu ndị a na-achọsi ike,
Obodo a na-agbakụtaghị azụ.
Copyright information for IboBIU